Psalms 111

Toonu Onyenwe anyị

1Toonu Onyenwe anyị!

Aga m eji obi m niile jaa Onyenwe anyị mma
nʼime nzukọ ndị ụzọ ha ziri ezi na nʼime ọgbakọ ukwuu.

2Ọrụ niile Onyenwe anyị na-arụ dị ukwuu;
ndị niile na-enwe mmasị na ha na-atụgharị uche nʼime ha.
3Ọrụ ya jupụtara nʼebube na ịma mma,
ezi omume ya na-adịgidekwa ruo mgbe ebighị ebi.
4O meela ka e cheta ọrụ ebube ya niile;
Onyenwe anyị bụ onye amara na onye ọmịiko.
5Ọ na-egboro ndị na-atụ egwu ya mkpa ihe oriri;
ọ na-echetakwa ọgbụgba ndụ ya ruo mgbe ebighị ebi.

6O gosila ndị ya ike nke ọrụ ya niile,
site nʼinye ha ala niile nke ndị mba ọzọ.
7Ọrụ aka ya niile bụ ihe kwesiri ekwesi na ikpe ziri ezi;
ụkpụrụ ya niile bụ ihe kwesiri ntụkwasị obi.
8E hiwere ha ịdị ruo mgbe niile ebighị ebi,
ha bụ ihe e mere nʼikwesị ntụkwasị obi na izi ezi.
9O wetaara ndị ya mgbapụta;
o meela ka ọgbụgba ndụ ya guzosie ike ruo ebighị ebi,
aha ya dị nsọ dịkwa oke egwu.

10Ịtụ egwu Onyenwe anyị bụ mmalite amamihe;
ndị niile na-edebe ụkpụrụ ya nwere ezi nghọta.
Otuto ya na-adị ruo mgbe ebighị ebi.
Copyright information for IboBIU